NTULE ỤFỌDỤ AJỌAGWA NDỊ NTOROBỊA MAKA NKWALITE OMENALA NA EZI NDỤ: MGBAKWASỊ ỤKWỤ N'AKWỤKWỌ EJIJE IGBO ATỌ.

Authors

  • Theodora Ngozi NNEBEDUM Ngalaba Amụmụ Sayensị Asụsụ na Asụsụ Naijirịa Ndị Ọzọ, Mahadum Etiti Alex Ekwueme dị n'Ebonyi Steeti
  • Pauline Chinasa NWIZU Ngalaba Amụmụ Sayensị Asụsụ na, Asụsụ Naijirịa Ndị Ọzọ, Mahadum Edukeshọn Alvan Ikoku dị n’Onwerri.
  • Chinyere Josphine NWACHUKWU Ngalaba Amụmụ Sayensị Asụsụ na Asụsụ Naijirịa Ndị Ọzọ, Mahadum Etiti Alex Ekwueme dị n'Ebonyi Steeti
  • Ifunanya Nzubechukwu DIMEBO Ngalaba Amụmụ Sayensị Asụsụ na Asụsụ Naijirịa Ndị Ọzọ, Mahadum Etiti Alex Ekwueme dị n'Ebonyi Steeti

Abstract

Ụmịedemede

Ụmụ na-eto eto bụ ọdịnihu ezinụlọ na obodo ọbụla. N'ihi nke a, e kwesịrị ịlebanye anya nke ọma n'ebimndụ na akparamagwa ha ka ha ghara iji ume okorobịa mehie ihe ga-ebutere ha nnukwu ọdachi na ndụ ha. Ọ bụ iji gbochie nke a ka e ji bagide nchọcha a. Nganga na mpako dịka ihe mkpuchi anya na ajọ akparamagwa nke aṅaghị ntị ezi ndụmọdụ na-ebutere ọtụtụ ndị ntorobịa ọdachi dị egwu tinyere ọghọm dị n'enyeghị nwata ezi ọzụzụ kpalitere mmụọ ọchọcha. Nchọcha a ji akwụkwọ ejije atọ ndị a họọrọ bụ Ọjaadịlị, Nwata Bulie Nna Ya Elu na Nganga Bụrụ Ụzọ wee mere ebe mgbakwasị ụkwụ ma jirikwa ihe mere na ndụ Ọjaadịlị, Emuka na Igolo wee tụlee ụfọdụ agwa ọjọọ ụmụ na-eto eto na-akpa n'oge ugbua ma gosipụtakwa ọghọm dị na ime mpako.  Mbunuche nchọcha a bụ ime ka ụmụ na-eto eto mata na ọdịda bụ ụgwọ ọrụ nganga na mpako nakwa na, ebe nnukwu uru dị bụ n'inwe obi umeala na ịnabata ezi ndụmọdụ, tinyere ngosipụta na ejije na-enye aka n'ụzọ dị egwu n'ebe o metụtara nkụzi na mgbazi ezi ụzọ. Atụtụ a gbadoro ukwu wee mee nchọcha a bụ atụtụ mkpakwasị agwa ebe e ji usoro nkọwasị were tụchaa njantụle bụ nke e nwetara site n'ọba akwụkwọ, intaneeti, na akwụkwọ ejije atọ ndị e ji mee nchọcha. Nchọcha a chọpụtara na ọ bụ nganga Ọjaadịlị kaara idula ya mmụọ, ejighị ezi ndụmọdụ kpọrọ ihe chụpụrụ Igolo na di, ebe mpako Emuka mere ya ọ laa akụ nna ya n'iyi. Arọ nchọcha a na-atụ bụ ka ọhaneze tumadi ụmụ na-eto eto gbara nganga na mpako ọsọ, nabata ezi ndụmọdụ ma were obi umeala mezie ihe ọbụla nganga na mpako mebiere ha tinyere ka ndị nne na nna jikọọ aka ọnụ nye ụmụ ha ezi ọzụzụ ma gbaziere ha ezi ụzọ n'agbanyeghị ma ọ bụ otú nwa ma ha adị ọtụtụ.

 

 

Abstract

Young people are the pride and future of every home and society. Hence, there is need for extra care, watchfulness and nurturing in their upbringing as it pertains to their behavior and lifestyle so that they will not truncate their future out of youthful exuberance. Moreso, non-adherence to good counsel and lack of good moral child grooming coupled with the high level of regret which is the resultant effect of pride and pomposity prompted this research topic with the aim of profering solution. This research work is of the view that humility, good upbringing/child training and adherence/compliance to good counsel will be of immense help. Data for analysis were obtained from the library, the internet and the three drama texts namely Ọjaadịlị, Nwata Bulie NnaYa Elu and Nganga BụrụỤzọ by Ọdụnke Artists, InnoỤzọma Nwadike and IjeomaNwaogu respectively. In conclusion, the research work opined that young people should desist and flee from pride for it leads to destruction but embrace good godly counsel and advice that will help build their life, career and future. The research therefore, advocates the need for young people to have a receptive heart and responsive attitude towards good counsel, constructive criticism and redemptive approach to life/issues.

Downloads

Published

2026-06-09

How to Cite

NNEBEDUM, T. N., NWIZU, P. C., NWACHUKWU, C. J., & DIMEBO, I. N. (2026). NTULE ỤFỌDỤ AJỌAGWA NDỊ NTOROBỊA MAKA NKWALITE OMENALA NA EZI NDỤ: MGBAKWASỊ ỤKWỤ N’AKWỤKWỌ EJIJE IGBO ATỌ. International Journal of Arts, Languages, Linguistics and Literary Studies, 15(2). Retrieved from https://jolls.com.ng/v2/index.php/jolls/article/view/298

Issue

Section

International Journal of Arts Languages, Linguistics and Literary Studies