Ụfọdụ Egwu Alụmalụ Ọdịnala Igbo: Mbụrụ Ndụmọdụ Nye Ndị na-aba n’ogo Alụmalụ Maka Mmepe Obodo
Abstract
Ụmị edemede:
Na mbụ, ndịigbo na-esite n’egwu alụmalụ enye ndị na-aba n’ogo alụmalụ ndụmọdụ iji chekwaba ezinaụlọ ha. Alụmalụ ebe a bụ nke na-adị n’etiti nwoke na nwaanyi. Alụmalụ na-enwe ebe mgbakwasị ụkwụ. Ọ bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ahụ na-eme ka alụmalụ nwee udo na ugwu. Ka ọ dị taa, ọ dịzị ka ọ bụ n’alụmalụ ụfọdụ ka ọgụ Naijiria na Biafra jere were ọnọdụ n’ihi tigbue-zọgbue dị na ha. Otụtụ chere na ọ bụ naanị n’ịhụnaanya ka alụmalụ na-ehibe isi. Ọ bụ nke a mere e jiri bagide nchọcha iji site n’egwu alụmalụ ọdịnala Igbo ụfọdụ chọpụta etu ndịigbo si eji mbụrụ were na-adụ ndị na-aba n’ogo alụmalụ ọdụ iji mee ka ha mata ihe ha na-aba n’ime ya. Usoro nnweta ngwa nchọcha bụ: nlere nsonye na ajujuọnụ. E ji atụtụ echiche mbụrụ nke Charters Black (2004) tụchaa data. A chọpụtara na; anaghị enye ndị mmadụ ndụmọdụ tupu ha abanye n’alụmalụ bụ na-ebute nsogbu. Naanị ịhụnaanya abụghị ihe a chọrọ. A na-etozu etozu abanye n’alụmalụ. A tụkwara aro ka a laghachi azụ n’usoro emume alụmalụ ọdịnala nke ji egwu enye ndụmọdụ dịka ọ dịbụ na mbụ. Nke a ga-eweta ezi mkpụrụ ma mee ka udo, agamniihu na nghọta lọghachitekwa n’ezinụlo niile.
Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2024 International Journal of Arts, Languages, Linguistics and Literary Studies

This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NoDerivatives 4.0 International License.